Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 6:7-17 Bible Nso (IGBOB)

7. Ha we si ndi Israel, Gabiganu, b͕a obodo ahu buruburu, ndi ejikere gāgabiga kwa n'iru ib͕e Jehova.

8. O rue, mb͕e Joshua gwara ndi Israel okwu, ndi-nchu-àjà asa ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru Jehova we gabiga, we nāfù opì-ike asa ahu: ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova we nējeso ha n'azu.

9. Ndi ejikere we nēje n'iru ndi-nchu-àjà ndi nāfù opì-ike asa ahu, ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e ahu n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

10. Joshua we nye ndi Israel iwu, si, Unu etila nkpu, unu ekwe-kwa-la ka anu olu-unu, okwu ọ bula agaghi-esi kwa n'ọnu-unu puta, rue ubọchi m'gāsi unu, Tienu nkpu; unu ewe tie nkpu.

11. Ọ we me ka ib͕e Jehova b͕a obodo ahu buruburu, nēje ya buruburu otù ub͕ò: ha we bata n'ọmuma-ulo-ikwū, nọ ọnọdu-abali n'ọmuma-ulo-ikwū.

12. Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.

13. Ndi-nchu-àjà asa ahu ndi nēbu opì-ike oké uda asa ahu n'iru ib͕e Jehova nējegide, nāfù kwa opì-ike asa ahu: ndi ejikere nēje kwa n'iru ha; ndi nāchikọta achikọta nējeso kwa ib͕e Jehova n'azu, ndi-nchu-àjà nāfù opì-ike asa ahu ka ha nēje.

14. N'ubọchi nke-abua ha we b͕a obodo ahu buruburu otù ub͕ò, we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū: otú a ka ha mere ubọchi isi.

15. O rue n'ubọchi nke-asa, na ha biliri n'isi-ututu mb͕e chi nābọ, we b͕a obodo ahu buruburu n'otù uzọ ahu ub͕ò asa: nání, n'ubọchi ahu ha b͕ara obodo ahu buruburu ub͕ò asa.

16. O rue, n'ub͕ò nke-asa, mb͕e ndi-nchu-àjà fùru opì-ike asa ahu, na Joshua siri ndi Israel, Tienu nkpu; n'ihi na Jehova enyewo unu obodo ahu.

17. Obodo ahu gābu ihe ewezugara nye Jehova, ya onwe-ya, na ihe nile di nime ya: nání Rehab, bú nwayi nākwa iko, gādi ndu, ya onwe-ya na ndi nile ya na ha nọ n'ulo, n'ihi na o zobere ndi-ozi ndi ayi zigara.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 6