Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 22:23-34 Bible Nso (IGBOB)

23. ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya;

24. ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n'iche uche okwu, si, N'ọdi-n'iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ?

25. n'ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n'etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n'itu egwu Jehova.

26. Ayi we si, Biko, ka ayi doziere onwe-ayi iwu ebe-ichu-àjà nka, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà:

27. kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.

28. Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n'ọdi-n'iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi na unu.

29. Ya buru ayi ihe-árú inupu isi n'okpuru Jehova, na isi n'iso Jehova chigharia ta, iwu ebe-ichu-àjà isure àjà-nsure-ọku, ma-ọbu inye onyinye-inata-iru-ọma, ma-ọbu ichu àjà, nāgughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi, di n'íru ebe-obibi-Ya.

30. Finehas, bú onye-nchu-àjà, na ndi isi nzukọ Israel, bú ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel, ndi soro ya je, we nu okwu nile nke umu Reuben na umu Gad na umu Manase kwuru, ọ we di nma n'anya-ha.

31. Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, we si umu Reuben, si kwa umu Gad, si kwa umu Manase, Ta ka ayi mara na Jehova nọ n'etiti ayi, n'ihi na unu emekpughi ihe-nmekpu a megide Jehova: ub͕u a ka unu naputaworo umu Israel n'aka Jehova.

32. Finehas nwa Eleeza, bú onye-nchu-àjà, na ndi-isi we si n'ebe umu Reuben nọ, na ebe umu Gad nọ, n'ala Gilead, lata, rue ala Kenean, lakuru umu Israel, we weghachiri ha okwu.

33. Okwu ahu we di nma n'anya umu Israel; umu Israel we gọzie Chineke, ha ekwughi kwa okwu irigokuru ha ibu agha, ibibi ala nke umu Reuben na umu Gad nēbi nime ya.

34. Umu Reuben na umu Gad we kpọsa okwu bayere ebe-ichu-àjà ahu, N'ihi na, ka ha kwuru, ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi, na Jehova bu Chineke.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 22