Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 22:18-28 Bible Nso (IGBOB)

18. na unu onwe-unu gēsi n'iso Jehova chigharia ta? ọ gēru kwa, ọ buru na unu anupu isi ta n'okpuru Jehova, na Ọ gēwesa nzukọ nile nke Israel iwe echi.

19. Otú ọ di, ọ buru na ala ihe-onwunwe-unu arua árú, gabigaranu onwe-unu rue ala ihe-onwunwe Jehova, ebe ebe-obibi Jehova nēbi, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe n'etiti ayi: ma unu anupula isi n'okpuru Jehova, unu anupu-kwa-la isi n'okpuru ayi, n'iwuru onwe-unu ebe-ichu-àjà nābughi ebe-ichu-àjà Jehova, bú Chineke-ayi.

20. Ekan nwa Zera, ọ̀ mekpughi ihe-nmekpu n'ihe ahu ewezugara nye Jehova, ma n'aru nzukọ nile nke Israel ka iwe dikwasi? ma ọ bughi nání ya onwe-ya, bú otù onye, kubirì ume n'ajọ omume-ya.

21. Umu Reuben na umu Gad na nkera ebo Manase we za, gwa ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Israel okwu, si,

22. Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Chineke Nke kachasi chi nile, bú Jehova, Ya onwe-ya mara, Israel kwa, ya onwe-ya gāmara; ọ buru na ọ bu nime nnupu-isi, ọ buru kwa na ọ bu nime nmekpu megide Jehova, (azọputala ayi ta,)

23. ka ayi wuworo onwe-ayi ebe-ichu-àjà isi n'iso Jehova chigharia; ọ buru kwa na ọ bu isure àjà-nsure-ọku ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma n'elu ya, ọ buru kwa na ọ bu ichu ihe àjà nke àjà-udo n'elu ya, ka Jehova Onwe-ya jua ase ya;

24. ọ buru kwa na ayi emeghi nka site n'iche uche okwu, si, N'ọdi-n'iru umu-unu gāgwa umu-ayi okwu, si, Gini ka unu na Jehova, bú Chineke nke Israel, nwekọrọ?

25. n'ihi na Jehova etiyewo ókè-ala n'etiti ayi na unu, umu Reuben na umu Gad, bú Jọdan; unu enweghi òkè nime Jehova: umu-unu ewe me ka umu-ayi kwusi n'itu egwu Jehova.

26. Ayi we si, Biko, ka ayi doziere onwe-ayi iwu ebe-ichu-àjà nka, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà:

27. kama ihe-àmà ka ọ gābu n'etiti ayi na unu, na n'etiti ọb͕ọ nile nke umu-ayi ndi gānọchi ayi, ka ayi we were àjà-nsure-ọku nile ayi, were kwa àjà nile ayi, were kwa àjà-udo nile ayi, fè òfùfè Jehova n'iru Ya; ka umu-unu we ghara isi umu-ayi n'ọdi-n'iru, Unu enweghi òkè nime Jehova.

28. Ayi we si, O gēru kwa, mb͕e ha gāsi ayi, si kwa ọb͕ọ nile nke umu-ayi n'ọdi-n'iru, otú a, na ayi gāsi, Lenu ihe-atù nke ebe-ichu-àjà Jehova, nke nna-ayi-hà mere, ọ bughi isure àjà-nsure-ọku, ọ bughi kwa ichu àjà: kama ihe-àmà ka ọ bu n'etiti ayi na unu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 22