Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 2:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Joshua nwa Nun we si na Shitim zipu ndikom abua na nzuzo, bú ndi-nledo, si, Jenu, le ala ahu, na Jeriko. Ha we je, ba n'ulo otù nwayi nākwa iko, aha-ya bu Rehab, ha we dina n'ebe ahu.

2. Ewe gwa eze Jeriko okwu, si, Le, ndikom batara n'ebe a n'abali a sitere n'umu Israel ileputa ala-ayi.

3. Eze Jeriko we zigara Rehab ozi, si, Me ka ha puta, bú ndikom ahu ndi bakutere gi, ndi bara n'ulo-gi: n'ihi na ọ bu ileputa ala nka nile ka ha biaworo.

4. Nwanyi ahu we kuru ndikom abua ahu, zobe ha; o we si, Ọ bu otú a, ndikom ahu bakuterem, ma amaghm ebe ha si bia:

5. o rue, mb͕e agaje imechi ọnu-uzọ-ama, n'ọchichiri, na ndikom ahu puru: amaghi ebe ndikom ahu jere: chuanu ha ngwa ngwa; n'ihi na unu gēru ha aru.

6. Ma ya onwe-ya mere ka ha rigo n'elu-ulo, o we zobe ha n'ókpòrò flax, nke edoro n'uso nye ya n'elu-ulo.

7. Ndikom ahu we nāchu ha n'uzọ Jọdan rue ngabiga-miri: ha we mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ndi nāchu ha n'azu pusiri.

8. Ma tutu ha onwe-ha edina ala, nwayi ahu we rigokuru ha n'elu-ulo;

9. ọ si ndikom ahu, Amawom na Jehova enyewo unu ala nka, amawokwam na oké ujọ-unu adakwasiwo ayi, amawokwam na ndi nile nēbi n'ala nka ab͕azewo n'iru unu.

10. N'ihi na ayi anuwo otú Jehova mere ka miri Oké Osimiri Uhie takọrọ n'iru unu, mb͕e unu siri n'Ijipt puta; na ihe unu mere eze abua nke ndi-Amorait, ndi bi n'ofè Jọdan, bú Saihon na Og, ndi unu wezugara ka ebibie ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 2