Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 19:25-39 Bible Nso (IGBOB)

25. Ókè-ala-ha we buru Helkat, na Hali, na Beten, na Akshaf;

26. na Alamelek, na Amad, na Mishal; ọ metu Kamel n'akuku Ọdida-anyanwu, metu kwa Shaihoa-libnat;

27. ọ we chigharia n'ọwuwa-anyanwu rue Bet-degon, we metu Zebulun, metu kwa ndagwurugwu Ifta-el n'akuku Ugwu rue Bet-emek na Neiel; ọ pua rue Kabul n'aka-ekpe,

28. na Ebron, na Rehob, na Hamon, na Kena, we rue Zaidon bara uba;

29. ókè-ala ahu we chigharia rue Rema, ru kwa obodo ahu ewusiri ike, bú Taia; ókè-ala ahu we chigharia rue Hosa; ọpupu-ya di kwa n'oké osimiri site na Hebel rue Akzib:

30. na Uma, na Efek, na Rehob: orú obodo na abua na obodo ntà ha.

31. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Asha dika ab͕uru nile ha si di, obodo ndia na obodo ntà ha.

32. Ọ bu umu Naftali ka ife-nzà nke-isi putara, bú umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di.

33. Ókè-ala-ha we site na Helef, site n'osisi terebinth nime Zaananim, na Adami-nekeb, na Jabneel, rue Lakum; ọpupu-ya we di na Jọdan:

34. ókè-ala ahu we chigharia n'akuku Ọdida-anyanwu rue Aznot-teboa, si n'ebe ahu pua rue Hukok; ọ metu Zebulun na Ndida, metu kwa Asha n'Ọdida-anyanwu, metu kwa Juda n'akuku Jọdan n'ọwuwa-anyanwu.

35. Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;

36. na Adama, na Rema, na Hezoa;

37. na Kedesh, na Edrei, na En-hezoa;

38. na Iron, na Migdal-el, na Horem, na Bet-anat, na Bet-shemesh; obodo iri na iteghete na obodo ntà ha.

39. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Naftali dika ab͕uru nile ha si di, obodo nile na obodo ntà ha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 19