Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 18:19-28 Bible Nso (IGBOB)

19. ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.

20. Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.

21. Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;

22. na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;

23. na Avim, na Para, na Ọfra;

24. na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:

25. na Gibeon, na Rema, na Beirot;

26. na Mizpeh, na Kefira, na Moza;

27. na Rekem, na Iapeel, na Tarala;

28. na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 18