Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 18:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.

20. Jọdan bu kwa ókè-ala-ya n'akuku Iru-anyanwu. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin, dika ókè-ala-ya nile si di buruburu dika ab͕uru nile ha si di.

21. Ma obodo ebo umu Benjamin nwere dika ab͕uru nile ha si di bu Jeriko, na Bet-họgla, na Emek-keziz;

22. na Bet-araba, na Zemaraim, na Bet-el;

23. na Avim, na Para, na Ọfra;

24. na Kefa-amoni, na Ọfni, na Geba; obodo iri na abua na obodo ntà ha:

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 18