17. Ọtniel nwa Kenaz, nwa-nne Keleb, we were ya: o we nye ya Aksa, bú nwa-ya nwayi, na nwunye.
18. O rue, mb͕e Aksa biara, na ọ kpaliri di-ya iriọ ubi n'aka nna-ya: Aksa si n'inyinya-ibu-ya rida; Keleb we si ya, Gini ka i nāchọ?
19. Ọ si, Nyem ngọzi; n'ihi na ọ bu ala Negeb ka i nyeworom, nyekwam isi miri ufọdu. Ọ we nye ya isi miri di n'elu, na isi miri di n'okpuru.
20. Nka bu ihe-nketa nke ebo umu Juda dika ab͕uru nile ha si di.
21. Obodo nke di na nsọtu ebo umu Juda nwere n'akuku ókè-ala Edom nime Negeb bu Kabzeel, na Ida, na Jagua;
22. na Kina, na Dimona, na Adada;
23. na Kedesh, na Hezoa, na Itnan;
24. na Zif, na Telem, na Bealot;
25. na Hezoa-hadata, na Keriot-hezron (nke ahu bu Hezoa);
26. na Amam, na Shema, na Molada;