Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joshua 11:11-22 Bible Nso (IGBOB)

11. Ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu nile nke di nime ya, ha wezugara ha ka ebibie ha: ọ dighi onye nēku ume fọduru: o sure Hezoa n'ọku.

12. Obodo nile nke ndi-eze ahu, na eze-ha nile, ka Joshua were, o were ọnu mma-agha tib͕ue ha, wezuga ha ka ebibie ha; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu.

13. Nání, obodo nile nke Jehova nke nēguzo n'obo-ha, Israel esureghi ha ọku, nāgughi Hezoa nání ya; nke ahu ka Joshua surere ọku.

14. Ihe-nkwata nile nke obodo ndia, na anu-ulo-ha, umu Israel lutara ha n'agha nye onwe-ha; nání na ha were ọnu mma-agha tib͕ue madu ọ bula, rue mb͕e ha kpochapusiri ha, ha ekweghi ka onye ọ bula nēku ume fọdu.

15. Dika Jehova nyere Moses, bú orù-Ya, iwu, otú a ka Moses nyere Joshua iwu: otú a ka Joshua me-kwa-ra; o wezugaghi okwu ọ bula n'ihe nile nke Jehova nyere Moses n'iwu.

16. Joshua we were ala ahu nile, bú ugwu, na Negeb nile, na ala Goshen nile, na ebe di ala ala, na Araba, na ugwu Israel, na ebe di ala ala ya;

17. site n'ugwu Halak, nke nārigo rue Sia, we rue Beal-gad nime ndagwurugwu Lebanon n'okpuru ugwu Heamon: eze-ha nile ka o were, tib͕ue ha, me ka ha nwua.

18. Ọtutu ubọchi ka Joshua busoro eze ahu nile agha.

19. Ọ dighi obodo nke mere ka ha onwe-ha na umu Israel di n'udo, ma-ọbughi ndi-Haivait ndi bi na Gibeon: ha nile ka ha were n'agha.

20. N'ihi na o sitere n'aka Jehova ime ka obi-ha di ike, izute Israel n'agha, ka O we wezuga ha ka ebibie ha, ka ha we ghara inwe amara, kama ka O we kpochapu ha, dika Jehova nyere Moses iwu.

21. Joshua we bia na mb͕e ahu, bipu ndi Anak ahu n'ugwu, bú nime Hebron, na nime Debia, na n'Anab, na n'ugwu Juda nile, na n'ugwu Israel nile: ha na obodo nile ha ka Joshua wezugara ka ebibie ha.

22. Ọ dighi ndi Anak fọduru n'ala umu Israel; nání nime Geza, na nime Gat, na n'Ashdod, ka ha fọduru.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joshua 11