Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jona 1:1-7 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,

2. Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.

3. Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.

4. Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.

5. Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n'ub͕ọ n'oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n'aru ha. Ma Jona ridarari n'ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n'oké ura.

6. Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.

7. Ha we sirita ibe-ha n'otù n'otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Jona 1