isiakwụkwọ

  1. 1
  2. 2
  3. 3
  4. 4

Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Jona 1 Bible Nso (IGBOB)

1. Okwu Jehova we rue Jona nwa Amitai nti, si,

2. Bilie, jerue Nineve, bú obodo uku, ahu, kpọsa okwu megide ya; n'ihi na ihe ọjọ ha arigotawo n'irum.

3. Jona we bilie isi n'iru Jehova b͕alaga na Tashish, o we rida na Jafo, chọta ub͕ọ nke nēje Tashish: ọ we tua ùtú-ya, ba nime ya, iso ha biarue Tashish ipu n'iru Jehova.

4. Ma Jehova tubàra ifufe di uku n'oké osimiri, oke ifufe di uku we di n'oké osimiri, ewe chè na ub͕ọ gētiwa.

5. Ndi-ub͕ọ we tua egwu, we tikue, onye ọ bula chi-ya; ha we tufue ihe nile nke di n'ub͕ọ n'oké osimiri, ime ka ọ di kari nfe n'aru ha. Ma Jona ridarari n'ime-ime-ala ub͕ọ; o we dina ala, da n'oké ura.

6. Onye-isi nke ndi-ọ̀kà-ub͕ọ we biakute ya nso, si ya, Gini nēme gi, gi onye oké ura? bilie, kpọkue Chineke-gi, eleghi anya Chineke gēcheta ayi, ayi we ghara ila n'iyì.

7. Ha we sirita ibe-ha n'otù n'otù, Bianu, ka ayi fe nzà, ka ayi we mara n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru. Ha we fe nzà nzà we ma Jona.

8. Ha we si ya, Biko, gosi ayi n'ihi onye ihe ọjọ a ruworo ayi aru; òle ozi i nēje? ọ̀ bu kwa ole ebe i si bia? òle ala-gi? òle ndi i siri nime ha puta?

9. O we si ha, Onye-Hibru ka m'bu; ọ bu kwa Jehova, bú Chineke nke elu-igwe, ka m'nātu egwu Ya, bú Onye mere oké osimiri na ala-akọrọ.

10. Ndikom ahu we tua oké egwu, si ya, Gini bu ihe a i meworo? N'ihi na ndikom ahu mara na ọ bu n'iru Jehova ka ọ nēsi b͕alaga, n'ihi na o gosiri ha-ri.

11. Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.

12. O we si ha, Bulienum, tubàm n'oké osimiri; oké osimiri ewe dajua ghara imakwasi unu: n'ihi na mu onwem amawo na ọ bu n'ihim ka oké ifufe di uku a nēfekwasi unu.

13. Ma ndikom ahu we nyasie ike inyaghachi ub͕ọ n'ala; ma ha apugh: n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu megide ha.

14. Ha we kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, biko, ekwela ka ayi la n'iyì n'ihi ndu nwoke a, etiyekwasi-kwa-la n'isi ayi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: n'ihi na Gi onwe-gi, bú Jehova, emewo dika o si tọ Gi.

15. Ha we bulie Jona, tubà ya n'oké osimiri: oké osimiri we guzo ọb͕ub͕ọ-ya.

16. Ndikom ahu we tua egwu Jehova nke-uku, ha we chuara Jehova àjà, kwe nkwa di iche iche.

17. Jehova we guputa otù azù uku ilo Jona; Jona we nọ n'afọ azù ahu ubọchi atọ ehihie na abali.