1. N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata,
2. M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.
3. Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.
4. Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.
5. Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu;
6. ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya:
7. le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;
8. M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.
9. Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.
10. Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.