Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Joel 3:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. N'ihi na, le, na mb͕e ahu na n'oge ahu, mb͕e M'gēme ka ndi Juda na Jerusalem adọtara n'agha lata,

2. M'gāchikọta mba nile, me ka ha rida na ndagwurugwu Jehoshafat; Mu na ha gēkpe kwa ikpe n'ebe ahu bayere ndim na ihe-nketam, bú Israel, ndi ha chusaworo n'etiti mba nile, ọ bu kwa alam ka ha kère.

3. Ọ bu kwa ndim ka ha fetaworo na nzà: ha we nye nwa-okoro iji b͕anwe nwanyi nākwa iko, nwa-mb͕ọ ka ha re-kwa-ra n'ihi manya-vine, ka ha we ṅua.

4. Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.

5. Ebe ọ bu ọla-ọcham na ọla-edom ka unu wereworo, ebe ọ bu kwa ezi ihem nile anāchọsi ike ka unu chibàworo n'ulo uku nile unu;

6. ebe ọ bu kwa umu Juda na umu Jerusalem ka unu nēre nye umu ndi Jevan, ka unu we me ka ha si n'ókè-ala-ha je n'ebe di anya:

7. le, M'gaje isi n'ebe ahu ebe unu nērega ha-ri kpọte ha, nyeghachi nmesò-unu n'isi-unu;

8. M'gēre kwa umu-unu ndikom na umu-unu ndinyom nye n'aka umu Juda, ha ewe re ha nye ndi Sheba, bú mba di anya: n'ihi na Jehova ekwuwo.

9. Kpọsanu nka n'etiti mba nile; donu agha nsọ: kpọtenu ndi-dike; ka ndi-agha nile biarue nso, rigota.

10. Kpugharianu mma-ọgè-unu ka ha buru mma-agha, na mma-ikwa-osisi-unu ka ha buru ube: ka onye-ume-ngwu si, Dike ka m'bu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Joel 3