Ọzọ kwa, gini ka unu gēmem, unu Taia na Zaidon na buruburu-ala nile nke Filistia? Ọ̀ di nmeso M'mesoworo unu unu onwe-unu nākwughachim, ma ọ̀ bu na ihe di unu onwe-unu nēmesom? M'gēji ngwa na ọsọ nyeghachi nmeso-unu n'isi-unu.