Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 7:9-18 Bible Nso (IGBOB)

9. Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10. Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11. Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

12. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?

13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

14. I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:

15. Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.

16. Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.

17. Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,

18. Na I nēleta kwa ya ututu nile,Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 7