Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 7:3-13 Bible Nso (IGBOB)

3. Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4. Ọ buru na edinam, m'si,Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5. Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6. Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7. Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8. Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.

9. Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10. Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

11. Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum;Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm;Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.

12. Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri,Na I nēdo ndi-nche ichem?

13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 7