13. Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi,Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14. I we were nrọ me ka m'tua ujọ,I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15. Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u,Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
16. Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi:Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.
17. Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku,Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,
18. Na I nēleta kwa ya ututu nile,Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?
19. Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya,Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?
20. Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu?N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ,M'we ghọrọ onwem ibu?