Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 7:1-10 Bible Nso (IGBOB)

1. Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa?Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?

2. Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò,Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:

3. Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu,Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.

4. Ọ buru na edinam, m'si,Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya;Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.

5. Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá;Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.

6. Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà,Ha we gwusia nenweghi olile-anya.

7. Cheta na ndum bu ifufe:Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.

8. Anya onye nāhum agaghi-ekirim:Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.

9. Dika igwe-oji si agwusi, we la,Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.

10. Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ,Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 7