Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 5:6-12 Bible Nso (IGBOB)

6. N'ihi na ajọ ihe adighi-esi n'ájá puta,Ọ bughi kwa n'ala ka ọnọdu ọjọ si epuputa;

7. Kama anāmuputa madu nye ọnọdu ọjọ,Dika icheke-ọku nile nēfeli elu.

8. Ma mu onwem, m'gāchọ Chineke,Chineke ka m'gēbo kwa okwum:

9. Onye nēme ihe uku, nke ngwuputa ala-ha nādighi;Oké ọlu rue mb͕e ọnu-ọgugu adigh:

10. Onye nēnye miri-ozuzo n'elu ala,Nēziga kwa miri n'elu ebe di n'èzi:

11. Ido ndi di ala n'ebe di elu;Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12. Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 5