14. N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.
15. O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.
16. Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.
17. Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.
18. N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.
19. Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.
20. N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu;B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.
21. Mb͕e ire nāpia utari agēzo gi;I gaghi-atu kwa egwu ihe-ike mb͕e ọ nābia.
22. I gāchì ihe-ike, chì kwa agu, ọchì;I gaghi-atu kwa egwu anu-ọhia nke uwa.
23. N'ihi na gi na nkume ọhia nile gādi n'ọb͕ub͕a-ndu;Gi na anu ọhia gādi kwa n'udo.
24. I gāma kwa na ulo-ikwū-gi di n'udo;I gēlekọta kwa ebe-obibi-gi, i gaghi-emehie kwa.
25. I gāma kwa na nkpuru-gi di ọtutu,Umu nke putara n'aru-gi gādi kwa ka ihe-ọkukú nke ala.