Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 5:11-20 Bible Nso (IGBOB)

11. Ido ndi di ala n'ebe di elu;Ndi nēyi uwe-nkpe nọ kwa n'elu nime nzọputa.

12. Ọ nēmebi èchìchè nile nke ndi-aghughọ,Aka-ha adighi-eme kwa ihe ha zubere.

13. Ọ nējide ndi mara ihe n'aghughọ-ha:Ndum-ọdu nke ndi nāb͕a nb͕a me-kwa-ra ngwa.

14. N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri,Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.

15. O we zọputa madu na mma-agha nke sitere n'ọnu-ha,Bú ndi-ob͕eye n'aka ndi di ike.

16. Onye nēnweghi ike we nwe olile-anya,Ma ajọ omume ekpuchiwo ọnu-ya.

17. Le, onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu, onye Chineke nābara nba:Aju-kwa-la idọ-aka-na-nti nke Onye puru ime ihe nile.

18. N'ihi na Onye ahu nēme ka ihe b͕ue nb͕u,Ọ nēké kwa eke; O nētib͕u, aka-Ya nēme kwa ka adiri ndu.

19. Nime nkpab͕u isi ka Ọ gānaputa gi;Ọzọ, n'asa ihe ọjọ agaghi-emetu gi aru.

20. N'oké unwu Ọ b͕aputawo gi n'ọnwu;B͕aputa kwa gi n'aka mma-agha n'agha.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 5