Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 41:18-22 Bible Nso (IGBOB)

18. Ize-uzere-ya nēme ka ìhè nēb͕upu,Anya-ya abua di ka mbubere-anya nke chi-ọbubọ.

19. N'ọnu-ya ka ọku-ọwa nāputa,Icheku-ọku nēwepuga kwa onwe-ha.

20. N'oghere-imi-ya abua ka anwuru-ọku nāputa,Dika nke ite anāfunwu ọku na amì nēre ere.

21. Iku-ume-ya nāmunye icheku,Ire-ọku nēsi kwa n'ọnu-ya puta.

22. N'olu-ya ka ike nwere ọnọdu-ya,Ọ bu kwa n'iru ya ka obi-ilọ-miri nēte egwú.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 41