4. Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia;Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.
5. Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?
6. Nke M'meworo ala ihe nādighi ka ọ buru ulo-ya,Me kwa ala bu nnú nnú ka ọ buru ebe-obibi-ya.
7. Ọ nāchì ùzù obodo ọchì,Ọ dighi-anu nbib͕o nke onye nāchi madu n'ihe-ike.
8. Ebe-nleputa nke ugwu bu ebe ọ nāzù onwe-ya,Akwukwọ ndu ọ bula ka ọ nāchọ.
9. Àtu gēkwe ibu orù-gi?Ma-ọbu ọ̀ gānọ ọnọdu-abali n'akuku ebe i nāzù anu-ulo-gi?
10. Ì gēji udọ̀-ya libe atu n'ihe-ọlu n'ọ̀b͕à ala-ubi?Ma-ọbu ò gēso gi me ndagwurugwu ka ha di lari?
11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?
12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?
13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?
14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,
15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.
16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;
17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.
18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.