Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 39:13-24 Bible Nso (IGBOB)

13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19. Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20. Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

21. Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya:Ọ nāpu izute ihe-agha.

22. Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.

23. Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya,Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.

24. Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 39