Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 39:11-27 Bible Nso (IGBOB)

11. Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne?Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?

12. Ì gēkwere na ya, na ọ gēbulata nkpuru-ọghigha-gi,Chikọta ọka nke ebe-nzọcha-ọka-gi?

13. Nkù nke enyi-nnunu nāṅuri ọṅu;Ma nkù-ya na ábúbà-ya, hà di ebere?

14. N'ihi na ọ nārapu àkwá-ya n'ala,Nēme ka ha kpo ọku n'elu ájá,

15. O we chezọ na ukwu gāzọpia ha,Ma-ọbu na anu-ọhia gāzọkwasi ha ukwu.

16. O mewo umu-ya ihe-ike, dika agāsi na ha abughi ihe o nwere:Ọ bu n'efu ka ndọb͕u ọ nādọb͕u onwe-ya n'ọlu bu, ma ọ tughi egwu;

17. N'ihi na Chineke emewo ya ka o chezọ amam-ihe,O kèghi kwa ya òkè nime nghọta.

18. Na mb͕e o ji seti onwe-ya n'elu ib͕a ọsọ,Ọ nāchì inyinya, nāchì kwa onye ọ nēbu, ọchì.

19. Ì nēnye inyinya idi-ike-ya?Ì nēyikwasi olu-ya ọzà nēme nkpatu?

20. Ì nēme ya ka ọ kwua ǹtù dika igurube?Ebube nke imapu-imi-ya di oké ujọ.

21. Ọ nābọ ukwu na ndagwurugwu, obi nātọ kwa ya utọ n'ike-ya:Ọ nāpu izute ihe-agha.

22. Ọ nāchì oké egwu ọchì, ma ọ dighi-atu ujọ;Ọ dighi-esi kwa n'iru mma-agha chighari azu.

23. Àkpà-àkú nēkwu wọghiri wọghiri n'elu ya,Ya na ob͕ub͕u-àmùmà nke ube, na arua.

24. Nime nmali-elu-ya na ime-nkpatu-ya o nēloda ala;Ọ dighi-ekwe kwa na ọ bu olu opi-ike.

25. Mb͕e ọ bula opi-ike ji adà udà ọ si, Ehe!Ọ bu kwa site n'ebe di anya ka ọ nānu ísì agha,Na éb͕è-elu-igwe, bú nbib͕ọ ndi-ọchi-gha, na iti-nkpu.

26. Ọ̀ bu site na nghọta-gi ka eb͕é nēfego n'elu,B͕asa kwa nkù-ya n'ebe Ndida di?

27. Ọ̀ bu n'okwu-ọnu-gi ka ugo nēfeli elu,Ma-ọbu me akwu-ya ka ọ di elu?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 39