1. Ì mawo mb͕e ewu-ọhia nke nkume di elu ji amu nwa?Ì nāriba ama mb͕e nne-ele nāmuputa nwa?
2. Ì nāgu ọnwa ha nọzuru n'imu nwa ọnu?Ma-ọbu ì mawo mb͕e ha ji amu nwa?
3. Ha nēruru ala, muputa umu-ha,Tuzuga ihe-nb͕u-ha.
4. Aru nāma umu-ha nma, ha nētolite n'ọhia;Ha nāpu, ha adighi-alaghachikute kwa ha.
5. Ònye zipuworo inyinya-ibu-ọhia ka o nwere onwe-ya?Ma-ọbu ònye tọpuworo ab͕u inyinya-ibu-ọhia?