Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 36:20-33 Bible Nso (IGBOB)

20. Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?

24. Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,Bú nke madu bùworo abù bayere ya.

25. Madu nile elewo ya anya;Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.

26. Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.

27. N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya:

28. Nke mbara-ígwé nāwuda, nātasa madu n'uba.

29. Ọzọ, ọ̀ di onye nāghọta nb͕asa igwe-ojiNbib͕ọ nke ulo-ntu-Ya?

30. Le, Ọ b͕asawo ìhè-Ya n'elu ya;Ebe dikarisiri omimi nke oké osimiri ka O kpuchiwo-kwa-ra.

31. N'ihi na ndia ka O ji nēkpe ndi nile di iche iche ikpe;Ọ nēnye ihe-oriri n'uba.

32. Ọ jiwo ìhè kpuchi ọbu-aka-Ya abua;We nye ya iwu imegide onye nēmegide Ya.

33. Nkpọtu-ya nēgosi ihe bayere Ya,Gosi kwa anu-ulo ihe bayere Onye nārigo.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 36