16. Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.
17. Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.
18. N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe;Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.
19. Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?
20. Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.
21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.
22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?
23. Ònye wereworo uzọ-Ya leta Ya?Ma-ọbu ònye siworo, I mewo ajọ omume?
24. Cheta ka i me ọlu-Ya ka ọ di uku,Bú nke madu bùworo abù bayere ya.
25. Madu nile elewo ya anya;Madu nēlegide ya site n'ebe di anya.
26. Le, Chineke di uku, ayi amaghi kwa Ya;Ọnu-ọgugu arọ-Ya enweghi kwa ngwuputa.
27. N'ihi na Ọ nēsepu nkpuru miri,Nke nāghọ miri-ozuzo diri alulu-Ya: