Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 36:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. Ma ọ buru na ha adighi-anu ha gāla n'iyì site n'ihe-agha,Kubìe ume nēnweghi ọmuma-ihe.

13. Ma ndi emeruru obi-ha emeru nēdo iwe n'obi:Ha adighi-etiku Chineke mb͕e O keworo ha ab͕u.

14. Nkpuru-obi-ha nānwu na nwata,Ndu-ha nāla kwa n'iyì n'etiti ndi edoro nsọ ikwa iko.

15. Ọ nādọputa onye ewedara n'ala na nweda-n'ala-ya.Ọ nēkpughe kwa nti-ha nime nmeb͕u.

16. Ọbuná otú a ka Ọ ràraworo gi isi n'ọnu nkpab͕uBa n'ebe sara mbara, nke ebe di nkpa nādighi n'okpuru ya;Ndọba ihe-oriri nke table-gi gējuputa kwa n'abuba.

17. Ma i juputawo n'okwu-ikpé nke onye nēmebi iwu:Okwu-ikpé na ezi ikpé nējide gi.

18. N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe;Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.

19. Ọ̀ gēdo àkù-gi n'usoro ka i ghara inọ na nkpà?Ma-ọbu ume nile nke ike-gi?

20. Ekusila ume ike ibiaru abali,Bú mb͕e ndi di iche iche nārigo n'ọnọdu-ha.

21. Lezie anya, echela ajọ ihe iru:N'ihi na nka ka i rọputaworo kari nweda-n'ala.

22. Le, Chineke nēme Onwe-ya ka Ọ nọ n'elu n'ike-Ya:Ònye bu onye-ozizí dika Ya?

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 36