Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 36:1-11 Bible Nso (IGBOB)

1. Elaihu we nēkwu kwa, si,

2. Cherem nwa mb͕e ntà, m'gēkwuputa-kwa-ra gi;N'ihi na okwu ọzọ di ikwuru Chineke.

3. M'gēsi n'ebe di anya bute ọmuma-ihem,Ọ bu kwa Onye kpurum ka m'gēnye ezi omume.

4. N'ihi na n'ezie ọ bughi okwu-ugha ka okwum nile bu:Onye zuru okè n'ọmuma-ihe nọyere gi.

5. Le, Chineke di ike, Ọ dighi-aju kwa onye ọ bula:Ọ di ike n'ike nke obi.

6. Ọ dighi-edebe ndu nke onye nēmebi iwu:Ma Ọ nēnye ndi ewedara n'ala ezi ikpé.

7. Ọ dighi-esepu anya-Ya n'aru onye ezi omume:Ma ọbuná n'ebe ndi-eze nọ n'oche-ezeKa Ọ nēme ka ha nọkwasi rue mb͕e ebighi-ebi, ha we di elu.

8. Ma ọ buru na ejide ha n'udọ̀ nke nweda-n'ala,Dika ndi ekeworo ab͕u nime nkpọrọ-ukwu;

9. O we nēgosi ha ọlu-ha,Na njehie nile ha, na ha nēme onwe-ha ndi di ike megide Ya.

10. O nēkpughe kwa nti-ha idọ ha aka na nti,Ọ si ha si n'ajọ ihe laghachi.

11. Ọ buru na ha anu, we fè Ya òfùfè,Ha gēme ka ubọchi nile ha gwusia n'ọdi-nma,Me kwa ka arọ nile ha gwusia n'ihe-utọ.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 36