Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 34:5-16 Bible Nso (IGBOB)

5. N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,Ma Chineke ewezugawo ikpém:

6. M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.

7. Òle madu di ka Job?Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,

8. Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,O we so ndi nēmebi iwu jeghari.

9. N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara maduMb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.

10. N'ihi nka, unu ndi nwere obi, genum nti:Ya buru Chineke ihe-árú, bú imebi iwu;Ya buru kwa Onye puru ime ihe nile ihe-árú, bú ime ajọ omume.

11. N'ihi na ọlu madu ka Ọ gākwughachi ya,Na dika uzọ nwoke si di, otú a ka Ọ gēme ka ọ huta.

12. E, n'ezie, Chineke agaghi-emebi iwu,Onye puru ime ihe nile agaghi-eme kwa ka ikpé buru ajọ omume.

13. Ònye mere Ya onye-nlekọta uwa?Ma-ọbu ònye doro elu-uwa dum madu bi?

14. Ọ buru na Ọ tukwasi ya obi-Ya,Ọ buru na Ọ chikọta mọ-ya na iku-ume-ya n'ebe Ọ nọ;

15. Anu-aru nile gēkubìkọ ume,Mdu gālaghachi kwa n'ájá.

16. Ma ọ buru na i nwere nghọta, nuru nka:Ṅa nti olu okwum nile.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 34