1. Elaihu we nāza, si,
2. Ndi-amam-ihe, nurunu okwum nile;Ndi mara ihe kwa, ṅanun nti.
3. N'ihi na nti nānwa okwu nile,Okpo-ọnu nēdetu kwa ihe-oriri.
4. Ka ayi rọputara onwe-ayi ikpé:Ka ayi mara n'etiti onwe-ayi ihe di nma.
5. N'ihi na Job siri, Abum onye ezi omume,Ma Chineke ewezugawo ikpém:
6. M'gēkwu okwu-ugha megide ikpém?Ọnyá-àkum adighi ngwọta, ọ bu ezie na njehie adighi.
7. Òle madu di ka Job?Ọ nāṅu ichì-ọchì dika miri,
8. Nēso kwa ndi nālu ajọ ihe ga ije, buru onye ejikọtara ya na ha,O we so ndi nēmebi iwu jeghari.
9. N'ihi na ọ siri, Ọ dighi ihe ọ bara maduMb͕e ihe Chineke nātọ ya utọ.