Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 33:8-22 Bible Nso (IGBOB)

8. N'ezie i kwuwo na ntim,Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,

9. Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

10. Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;

11. O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.

12. Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi:N'ihi na Chineke di uku kari madu.

13. Gini mere i ji so Ya se okwu,Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?

14. N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.

15. Na nrọ, bú ọhù nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;

16. Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,

17. Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;

18. Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.

19. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:

20. Nri we nāsọ ndu-ya oyi,Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.

21. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.

22. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 33