Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 33:3-11 Bible Nso (IGBOB)

3. Okwu-ọnum nile gēkwuputa izi-ezi nke obim:Ihe eb͕ub͕ere-ọnum mara ka ha kwuworo n'idi-ọcha.

4. Mọ nke Chineke emewom,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka m'di ndu.

5. Ọ buru na i puru, zaghachim;Do okwu-gi n'usoro n'irum, guzo onwe-gi.

6. Le, mu onwem di ka i si di n'ebe Chineke nọ:Site n'urọ ka akpurum, ọbuná mu onwem.

7. Le, oké ujọm agaghi-eme ka i tua egwu nke-uku,Nbigide-akam agaghi-adi kwa arọ́ n'aru-gi.

8. N'ezie i kwuwo na ntim,Olu okwu nile ka m'nānu kwa, si,

9. Mu onwem di ọcha n'obi, nēnweghi njehie;Onye nācha ucha ka m'bu, ajọ omume adighi kwa nimem:

10. Le, ihe iji jum aju ka Ọ nāchọputa,Ọ nāgum n'onye-iro n'ebe Ọ nọ;

11. O nētiye ukwum abua nime ọtọsi,Nēlezi kwa okporo-uzọm nile anya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 33