12. Le, ọ bu na nka ka i nābughi onye ezi omume; m'gāza gi:N'ihi na Chineke di uku kari madu.
13. Gini mere i ji so Ya se okwu,Si na Ọ dighi-aza okwu bayere ihe ọ bula Ọ nēme?
14. N'ihi na otù ub͕ò ka Chineke nēkwu,E, ub͕ò abua, ma madu adighi-ariba ya ama.
15. Na nrọ, bú ọhù nke abali,Mb͕e oké ura nādakwasi madu,N'itu-òrù-ura n'elu ihe-ndina;
16. Mb͕e ahu ka Ọ nēkpughe nti madu,Nākachi kwa idọ-aka-na-nti-ha akàrà,
17. Ime ka madu si n'omume-ya wezuga onwe-ya,Na isi n'ebe onye di ike nọ kpuche npako;
18. Ọ nēb͕ochi nkpuru-obi-ya n'ida n'olùlù,Ọ nēb͕ochi kwa ndu-ya n'igabiga site n'ihe-agha.
19. Abawo-kwa-ra ya nba n'ihe-nb͕u n'elu ihe-ndina-ya,Ya na ilu-ọ̀gù nādigide adigide n'ọkpukpu-ya nile:
20. Nri we nāsọ ndu-ya oyi,Ihe-oriri nke ọ nāchọsi ike nāsọ kwa nkpuru-obi-ya oyi.
21. Anu-aru-ya nāgwusi, ewe ghara ihu ya anya;Ọkpukpu-ya nile nke anādighi-ahu anya aputawo kwa n'elu.
22. Nkpuru-obi-ya we nābiaru nso olùlù,Ndu-ya nābiaru kwa nso ndi nēme ka anwua.
23. Ọ buru na mọ-ozi anọ n'akuku ya,Bú onye-nsughari, otù onye n'etiti nnù ndi-mọ-ozi abua na ọgu iri,Igosi madu izi-ezi-ya;
24. Ọ gēme-kwa-ra ya amara, si,Dọputa ya n'irida n'olùlù,Achọtawom ihe-nb͕aputa.
25. Anu-aru-ya gādi ọhu kari nke nwataỌ nālaghachiru ubọchi okorọbia-ya:
26. Ọ nāriọ Chineke aririọ, ihe-ya we nātọ Ya utọ;O we were iti-nkpu-ọṅù hu iru-Ya:O we nyeghachi madu ezi omume-ya.
27. Ọ nābù abù n'iru madu, si,Emehiewom, me kwa ihe ziri ezi ka ọ buru ajọ omume,Ma ọ baghm n'ihe: