Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 32:4-8 Bible Nso (IGBOB)

4. Ma Elaihu chere Job n'ikwu okwu, n'ihi na ndi-okenye ka ha bu kari ya onwe-ya n'ubọchi ndu-ha.

5. Elaihu we hu na ihe-ọziza adighi n'onu ndikom atọ ahu, iwe-ya we di ọku.

6. Elaihu nwa Barakel, bú onye Buz, we za, si,Nwata ka m'bu n'ubọchi ndum, ma unu onwe-unu bu ndi kara nká;N'ihi ya ka m'rapuru, we tua egwu ikwuputara unu ihe m'mara.

7. Asirim, Ubọchi bara uba gēkwu okwu,Ọtutu arọ gēme kwa ka amara amam-ihe.

8. N'ezie mọ di nime madu,Iku-ume nke Onye puru ime ihe nile nēme kwa ka ha ghọta ihe.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 32