Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 30:4-19 Bible Nso (IGBOB)

4. Ndi nānyajipu mallow n'akuku umu-osisi;Nkpọrọgwu osisi broom bu kwa nri-ha.

5. Anēsi n'etiti madu chupu ha;Ha nētiso ha nkpu dika anētiso onye-ori.

6. N'ebe nākpata ima-jijiji nke ndagwurugwu ka ha nāghaghi ibi,Bú ọnu atùru n'ájá na n'oké nkume.

7. N'etiti umu-osisi ka ha nēti nkpu dika inyinya-ibu;N'okpuru akuba ka ha nējikọta onwe-ha.

8. Ha bu umu ndi-nzuzu, e, umu nke ndi nēnweghi aha;Apiapuwo ha n'ala.

9. Ma ub͕u a aghọwom abù ha nābù n'ikpọ ubọ-akwara,M'bu-kwa-ra ha okwu ha nēkwughari.

10. Ha nākpọm ihe-árú, ha nọ n'ebe di anya site n'ebe m'nọ,Ha eb͕ochighi kwa onwe-ha n'ibu ọnu-miri n'irum.

11. N'ihi na Ọ tọpuwo udọ̀-Ya, we wedam n'ala,Ha achipuwo kwa bridle n'irum.

12. N'aka-nrim ka ab͕ọ ahu nēbili;Ukwum abua ka ha nupuworo,We tulie uzọ nhuju-anya-ha megidem.

13. Ha emebiwo uzọm,Ha bara nmebim urù,Bú ndi nēnweghi onye nēyere ha aka.

14. Dika ọ bu na nitpú sara mbara, otú a ka ha nābia:N'okpuru ntikpọ ahu ka ha turuworo onwe-ha n'arum.

15. Ihe-egwu echighariwo imegidem,Ha nāchu ọkakam dika ifufe;Dika igwe-oji ka nzọputam gabigawo-kwa-ra.

16. Ma ub͕u a anāwusi nkpuru-obim nimem dika miri;Ubọchi nweda-n'ala nējidem.

17. N'abali ọkpukpum nēsiwasi nādapu n'arum,Ihe-nb͕u nke nārọm árú anọghi n'otù ebe.

18. Site n'iba-uba nke ike nke ọriam uwem nēnwoghari:Dika ọnu uwe-imem ka ọ nēkem buruburu.

19. Ọ tubàwom n'apiti,M'we yie ájá na ntu.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 30