18. M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:
19. Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di,Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:
20. Nsọpurum di ọhu nimem,Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.
21. Mu ka madu gere nti, we chere,Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.
22. Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.
23. Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo;Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.
24. M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere;Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.