14. Ezi omume ka m'yiri dika uwe, o we werem yikwasi onwe-ya:Ezi ikpém di ka uwe-nwuda na ákwà-ike-n'isi.
15. Anya ka m'ghọro n'ebe onye-ìsì nọ,Ukwu n'ebe onye-ngwurọ nọ ka m'ghọ-kwa-ra.
16. Nna ka m'buru ndi-ob͕eye:Okwu-ikpé m'nāmaghi kwa, anamegwuputa ala-ya.
17. M'we tijie ikiri-ezé nke onye ajọ omume,Si n'ezé-ya tupu anu ọ dọb͕uru.
18. M'we si, N'akwum ka m'gēkubì ume,Dika ájá ka m'gēme kwa ka ubọchim ba uba:
19. Awasawo nkpọrọgwum n'ebe miri di,Igirigi gānọ kwa ọnọdu-abali n'alakam:
20. Nsọpurum di ọhu nimem,Utam gāb͕anwe kwa ọhu n'akam.
21. Mu ka madu gere nti, we chere,Ha nānọ kwa dū inu ndum-ọdum.
22. Mb͕e okwum gwusiri, ha adighi-ekwu kwa okwu-ha nke ub͕ò abua;Okwum nābukwasi kwa ha dika miri-ozuzo.
23. Ha nēcherekwam dika esi echere miri-ozuzo;Ha saghepu-kwa-ra ọnu-ha dika ọ bu inara miri-ozuzo ikpe-azu.
24. M'chìa ha ọchì, ha adighi-ekwere;Ha adighi-eme kwa ka ìhè irum da.