16. Adighi-eji ọla-edo ọma nke Ofia,Adighi-eji kwa onyx di oké ọnu-ahia, ma-ọbu sapphire, tù ya.
17. Adighi-ewere ọla-edo na enyo turu ya:Ihe ọla-edo anuchara anucha abughi kwa ihe-nb͕anwe-ya.
18. Agaghi-ehota coral na crystal:E, nnweta amam-ihe kariri ruby.
19. Adighi-ewere topaz nke Etiopia turu ya,Adighi-eji ọla-edo ọma anāgwaghi agwa tù ya.
20. Ma amam-ihe, òle ebe o si bia?Òle ebe kwa ka ọ bu, bú ọnọdu nghọta?
21. N'ihi na ezonariwo ya n'anya ihe nile di ndu,Esiwo kwa n'anu-ufe nke elu-igwe zopu ya.
22. Ebe-ila-n'iyì na ọnwu siri,Na nti-ayi ka ayi nuworo akukọ-ya.
23. Chineke aghọtawo uzọ-ya,Ya onwe-ya amawo kwa ọnọdu-ya.
24. N'ihi na Ya onwe-ya nēlegide ihe anya rue nsọtu nile nke uwa,N'okpuru elu-igwe nile ka Ọ nāhu ihe;