Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 27:12-22 Bible Nso (IGBOB)

12. Le, unu onwe-unu nile ahuwo ya;N'ìhi gini kwa ka unu nāghọsi ihe-efu?

13. Nka bu òkè madu nēmebi iwu n'ebe Chineke nọ,Na ihe-nketa nke ndi nēme ka madu ma jijiji, nke ha nānara n'aka Onye puru ime ihe nile.

14. Ọ buru na umu-ya amuba, ọ bu inye mma-agha;Umu nke putara n'aru-ya agaghi-eriju kwa nri afọ.

15. Agēli ndi-ya fọduru n'ọnwu,Ndinyom-ya di-ha nwuru agaghi-akwa ákwá.

16. Ọ buru na ọ kwakọba ọla-ọcha dika ájá,Dozie uwe dika urọ;

17. O gēdozi ya, ma onye ezi omume gēyi ya,Onye nēmeghi ihe ọjọ gēkè kwa ọla-ọcha.

18. O wuwo ulo-ya dika nla,Na dika ulo-ntu nke onye-nche meworo.

19. O nēdina buru ọgaranya, ma agaghi-achikọta ya;Ọ saghewo anya ya abua, ma ọ nọghi.

20. Ihe-egwu nēru ya aru dika miri;Oké ifufe ezupuwo ya n'abali.

21. Ifufe Iru-anyanwu nēburu ya, o we la;O we fechapu ya n'ọnọdu-ya.

22. Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya:N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 27