Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 24:19-24 Bible Nso (IGBOB)

19. Ikpọ-nku na okpom-ọku nānapu miri snow n'ike:Otú a ka ala-mọ nēme ndi mehieworo.

20. Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri;Agaghi-echeta kwa ya ọzọ:Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.

21. Ọ nēmeb͕u nwayi-àgà nke nādighi-amu nwa;Ọ dighi-eme kwa nwayi di-ya nwuru nma.

22. Ma O mewo ka ndi di ike nke-uku nādigide ndu site n'ike-Ya:O nēbili, ma ọ dighi onye kwere na ọ gādi ndu.

23. Chineke nēme ka ọ nọ na ntukwasi-obi, ọ nādabere kwa na ya;Ma anya-Ya dikwasi n'uzọ nile ha.

24. Ha di elu; na nwa mb͕e ha anọghi;Akwadawo kwa ha, chikọba ha dika madu nile,Ewe bipu ha dika ọnu-ọnu oko ọka.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 24