Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 23:9-17 Bible Nso (IGBOB)

9. M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.

10. N'ihi na Ọ mawo uzọ m'nāga;Mb͕e Ọ nwaputasirim, dika ọla-edo ka m'gāputa.

11. Nzọ-ukwu-Ya ka ukwum nējisi ike iso;Uzọ-Ya ka m'debeworo, adighm-ewezuga kwa onwem.

12. Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya;Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.

13. Ma Ya onwe-ya nọ n'otù èchìchè, ònye kwa gechighari Ya?Nkpuru-obi-Ya achọsiwo kwa ike, O we me ya.

14. N'ihi na Ọ nēmezu ihe bu òkèm:Ma ọtutu ihe dika ihe ndia di n'aka-Ya.

15. N'ihi ya ka m'nāma jijiji n'iru Ya;Anamaghọta, m'nātu kwa oké egwu Ya.

16. N'ihi na Chineke emewo ka obim lọ miri,Onye puru ime ihe nile emewo kwa ka m'ma jijiji:

17. N'ihi na ekpochapughm n'iru ọchichiri,O kpuchighi kwa oké ọchichiri n'irum.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 23