Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 23:1-9 Bible Nso (IGBOB)

1. Job we za, si,

2. Ọbuná ta nnupu-isi ka ntamum bu:Akam di arọ́ n'ihi ize-umem.

3. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na amaram ebe m'gāchọta Ya!Ma asi na agamabiaru ọnọdu-Ya guzosiri ike!

4. Ka m'do ikpém n'usoro n'iru Ya,Meju kwa onum n'iru-uka.

5. Kam'mara okwu nile Ọ gāzaghachim,Ka m'ghọta kwa ihe Ọ gāsim.

6. Ọ̀ bu n'uba ǹke ike-Ya ka O gēkpesom ikpe?É-è; kama Ya onwe-ya gēchem iru.

7. N'ebe ahu ka onye ziri ezi nēso Ya ru uka;Ewe me ka m'b͕apu n'aka Onye-ikpem rue mb͕e ebighi-ebi.

8. Le, m'ga n'iru, ma Ọ nọghi ya;M'ga kwa n'azu, ma adighm-ahuta Ya:

9. M'ga n'aka-ekpe, mb͕e Ọ nālu ọlu, ma adighm-ahu Ya anya:Ọ nēkpuchi Onwe-ya n'aka-nri, m'we ghara ihu Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 23