Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 22:12-26 Bible Nso (IGBOB)

12. Chìneke anọghi n'ebe di elu nke elu-igwe?Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!

13. I we si, Gini ka Chineke mara?Ò gēsi n'azu oké ochichiri kpe ikpe?

14. Igwe-oji b͕ara ọchichiri nāburu Ya ebe-nzuzo, Ọ dighi-ahu kwa uzọ;Ọ bu kwa buruburu elu-igwe ka Ọ nējeghari.

15. Ì gēdebe uzọ ochie,Nke ndikom nēme ajọ ihe zọkwasiworo ukwu?

16. Bú ndi apunara, ma mb͕e-ha akērughi,Ndi awusiri ntọ-ala-ha dika osimiri:

17. Ndi nāsi Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi:Ọzọ, Gini ka Onye puru ime ihe nile gēmere ha?

18. Ma Ya onwe-ya mejuru ulo nile ha n'ezi ihe:Ma ndum-ọdu ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ.

19. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria;Onye nēmeghi ihe ọjọ nāchì kwa ha ọchì:

20. Si, N'ezie ezopuwo ha n'uwa, bú ndi nēbili imegide ayi,Ọku eripiawo kwa ihe-ha fọduru.

21. Biko, mara Ya nke-ọma, we nọ n'udo:Nime ihe ndia ka ọdi-nma gābiakute gi.

22. Biko, nara iwu n'ọnu-Ya,Do kwa okwu-Ya nile n'obi-gi.

23. Ọ buru na i laghachikute Onye puru ime ihe nile, agēwuli gi elu dika ulo;I gēme ka ajọ omume di anya n'ebe ulo-ikwū-gi nile di.

24. Tọb͕ọ kwa àkù-gi n'elu ájá,Na ọla-edo Ofia n'etiti nkume miri-iyi;

25. Onye puru ime ihe nile gābu kwa àkù-gi,Ọla-ọcha di oké ọnu-ahia ka Ọ gābu-kwa-ra gi.

26. N'ihi na mb͕e ahu ihe nke onye puru ime ihe nile gātọ gi utọ,I gēwelite-kwa-ra Chineke iru-gi.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 22