1. Elifaz, bú onye Timan, we za, si,
2. Ọ̀ bu Chineke ka madu nābara n'ihe?É-è, kama onye nwere uche nābara onwe-ya n'ihe.
3. Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume?Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?
4. Ọ̀ bu egwu-gi kpatara O ji bara gi nba,We so gi ba n'ikpé?
5. Ìhe ọjọ gi abaghi uba?Ọ dighi kwa nsọtu diri ajọ omume-gi.
6. N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu,Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.
7. I dighi-eme ka onye nāda #mbà ṅua miri,I nēb͕ochi kwa nri n'ebe onye-agu nọ.
8. Ma nwoke nke ogwe-aka-ya di ike, ọ bu ya nwe uwa;Onye anāhu iru-ọma nēbi kwa nime ya.
9. I zipuwo ndinyom di-ha nwuru n'aka efu,Anānyaji kwa ogwe-aka nke umu-nb͕ei.
10. N'ihi ya ib͕udu di gi buruburu,Oké egwu mberede nāma kwa gi jijiji,