Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 20:17-27 Bible Nso (IGBOB)

17. Ọ gaghi-ele miri-iyi anya,Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.

18. Ọ nēnyeghachi ihe ọ dọb͕uru onwe-ya n'ọlu inwe, ọ gaghi-eleda ya;Dika àkù nke ihe-nb͕anwe-ya si di, ọ gaghi-aṅuri ọṅu otú a.

19. N'ihi na ọ zopiawo ndi-ob͕eye, rapu kwa ha;Ọ napuwo ulo n'ike, ọ gaghi-ewu kwa ya.

20. N'ihi na ọ dighi-ama udo n'afọ-ya,Ya mere ọ gaghi-eji ihe-ya anāchọsi ike wepuga onwe-ya.

21. Ọ dighi ihe fọduru nke ọ nērighi;N'ihi ya ọdi-nma-ya agaghi-adi ike.

22. N'ojuju nke ozùzù-ya nkpà nākpà ya:Aka onye ọ bula nke nọ n'ọnọdu ọjọ gābiakwasi ya.

23. Ka o rue, n'iriju afọ-ya,Na Chineke gēzitere ya idi-ọku nke iwe-Ya,Na Ọ gēme kwa ka o zokwasi ya dika miri-ozuzo nime nri-ya.

24. Ọ gēsi n'ihe-ekike-agha ígwè b͕alaga,Uta ọla gāb͕apue ya.

25. Ọ dọputawo ya, o we si n'aru-ya puta:Ọnu-ọnu-ya nke nēb͕upu àmùmà nēsi kwa n'òlùlù-ya puta;Oké ujọ nile di n'aru ya.

26. Ọchichiri nile ka ezobeworo ibu ihe-ya atukobara atukọba:Ọku nke anāfunwughi afunwu gēripia ya;Ọ gērechapu ihe fọduru n'ulo-ikwū-ya.

27. Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya,Ala nēbili kwa imegide ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 20