21. Me ka ọbu-aka-Gi dipu n'arum n'ebe di anya;Ka oké ujọ-Gi ghara kwa ime ka m'tua egwu nke-uku.
22. Gi kpọ kwa òkù, mu onwem gāza kwa;Ma-ọbu ka m'kwue, I we zam.
23. Àjọ omume na nmehie m'nwere di ole?Me ka m'mara njehiem na nmehiem.
24. N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi,Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?