Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 13:2-15 Bible Nso (IGBOB)

2. Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.

3. Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.

4. Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,Ndi-dibia efu ka unu nile bu.

5. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!Ọ we ghọro unu amam-ihe.

6. Biko, nurunu iru-ukam,Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.

7. Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?

8. Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?

9. Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?

10. Ọ ghaghi ibara unu nba,Ọ buru na unu ahu madu iru-ọma na nzuzo.

11. Nbùli-elu-Ya adighi-eme ka unu tua egwu nke-uku?Oké egwu-Ya adighi-adakwasi kwa unu?

12. Okwu-ncheta nile unu bu ilu nke ntu,Ihe-nb͕ochi urọ ka ihe-nb͕ochi nile unu bu.

13. B͕anu nkiti, pua n'ebe m'nọ, ka m'kwu kwa, mu onwem,Gini gāgabiga kwa n'arum?

14. N'ìhi gini ka m'gēburu anu-arum n'ezém,Tiye kwa ndum n'ọbu-akam?

15. Le, Ọ gēb͕um; m'gaghi-echere:Otú ọ di, uzọm nile ka m'gāru uka n'iru Ya.

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 13