1. Le, ihe a nile ka anyam huworo,Ntim anuwo, ghọta kwa ya.
2. Dika ọmuma-ihe-unu si di, otú a ka m'maworo, ọbuná mu onwem:Mu onwem abughi onye dara ada kari unu.
3. Ma mu onwem, Onye Nke puru ime ihe nile ka m'gāgwa okwu,Ọ nātọkwam utọ isoro Chineke ru uka.
4. Ma otú ọ di, unu onwe-unu bu ndi nētekpu madu okwu-ugha dika ihe-ntekpu,Ndi-dibia efu ka unu nile bu.
5. Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na unu ab͕asi nkiti!Ọ we ghọro unu amam-ihe.
6. Biko, nurunu iru-ukam,Ṅa-kwa-nu nti n'ikpe-ọnu nile nke eb͕ub͕ere-ọnum.
7. Ọ̀ bu Chineke ka unu gēkwuru okwu ajọ omume?Ọ̀ bu Ya ka unu gēkwu-kwa-ra okwu aghughọ?
8. Ọ̀ bu Ya ka unu gāhu iru-ọma?Ọ̀ bu Chineke ka unu gāluru ọ̀gù?
9. Ọ̀ di nma ka O gwuputa ala unu?Ma-ọbu dika madu si akwa madu emò, ọ̀ bu otú a ka unu gākwa Ya emò?