Agba Ochie

Agba Ọhụrụ

Job 11:9-14 Bible Nso (IGBOB)

9. Ọtùtù-ya di ogologo kari uwa,Di kwa obosara kari oké osimiri.

10. Ọ buru na Ọ ga n'iru, mechibido madu uzọ,Kpọkọta nkpọkọta, ònye gēme kwa ka Ọ laghachi?

11. N'ihi na Ya onwe-ya mara madu efu:Ọ nāhu kwa ajọ ihe, mb͕e Ọ nādighi-elegide ya anya.

12. Ma nkpọkọrọ madu gēnwe obi,Mb͕e amuru nwa-inyinya-ibu-ọhia ka ọ buru madu.

13. Ọ buru na gi onwe-gi edozie obi-gi,We b͕asa ọbu-aka-gi abua n'ebe Ọ nọ;

14. Ọ buru na ajọ ihe adi n'aka-gi, me ka ọ di n'ebe di anya,Ekwe-kwa-la ka ajọ omume biri nulo-ikwū-gi nile;

Agụ zuru ezu isiakwụkwọ Job 11